Saturday, August 6, 2022

IBI UGWU N'OMENALA IGBO (CIRCUMCISION IN IGBO CULTURE)

 

Ibi úgwù, circumcision

(IGBO)


    Ọ bụ ihe ihere nyere nwoke Igbo ọbụla na-ebighị úgwù. Ibi úgwù bụ ihe ndị nnukwu mkpa n'omenala ya na kwa okpukpere chi n'ala Igbo. 

GỊNỊ BỤ IBI ÚGWÙ 


    Akwụkwọ Okowa okwu nke English sịrị na ọ bụ "iwepụ akpụkpọ anụ nke dị n'amụ nwoke maọbụ ikpu nwaanyị." N'oge gboo, ndị Igbo na-ebi nwoke na nwaanyị úgwù. Mana n'oge ugbua, ọ bụ naanị ụmụ nwoke ka ana ebi úgwù, nwata maọbụ okenye. 

ONYE NA-EBI ÚGWÙ 


    Ọ bụ naanị onye maara anya ya nwere ike ibi úgwù ka e wee gbanahụ ihe ọghọm. N'oge gboo, ọ bụ ụmụ nwaanyị ime maọbụ dibịa nwere ike úgwù. E nwere ndị ọzọ ọ bụ ọrụ ha ibi úgwù. Mana n'oge ugbua, ọ bụ ọrụ ndị na-ahụ maka arụ ike ibi ụmụ aka a mụrụ ọhụrụ ugwù n'ụlọ ọgwụ. 

KEDỤ MGBE A NA-EBI ÚGWÙ 


    N'omenala Igbo, ọ na bu karị n'ụbọchị nke asatọ e ji mụọ nwa ka a na-ebi ya úgwù (ya bụ izu ụka abụọ dị ka ndị Igbo si agụ izu uka). E nwere n'akụkụ Igbo ebe a na-ebi úgwù n'ụbọchị nke atọ ejiri mụọ nwa. E nwere mgbe ụfọdụ a na-ebi ugwu n'okenye mana ọ dịghị eme karị. Ibi úgwù na-egbu oge karịa na ndị okenye ma gbu oge tupu ọnya ya gwọọ. N'ụmụ aka, ọ na-agwọ n'ihe dịka ụbọchị 5-7.

E NWERE URU IBI ÚGWÙ BARA 


    Ndị Igbo kwenyere na-enwere ọtụtụ uru ibi úgwù bara nwoke nke gụnyere:

  • Ị gbanahụ ụfọdụ ọrịa na-efe efe dịka ọrịa mamịrị 
  • Ị debe  okirikiri ahụ ọcha 
  • Ịbeneta ọrịa si na mmekọ nwoke na nwaanyị.

E NWERE IHE ỌGHỌM DỊ NA-IBI ÚGWÙ 


    Ụfọdụ ihe ọghọm dị na-ibi úgwù gụnyere:

  • Usoro esi eme ya na-egbu mgbu.
  • E nwere ike ịnweta ọrịa na-efe efe na ya.
  • Ọ nwere ike imerụ mmadụ ahụ ma ọ bụrụ na-akpachapụghị anya were mee ya. 


(ENGLISH)


    One of the potential cause of shame for an Igbo man is if he happens to be uncircumcised. Thus, it is very evident that circumcision is very necessary in Igbo culture and Traditional religion.

WHAT IS CIRCUMCISION 

 
     The English Dictionary explains it as a "surgical removal of the foreskin of the penis (in men) or the clitoral hood the clitoris (in female). Though in formal times, the Igbo people circumcised both male and female. However, in more contemporary times, the Igbos have restricted the act of circumcision to only male children or Adults

WHO ADMINISTERS CIRCUMCISION 

    
    It is the work of experts to administer circumcision in other to avoid casualties. In ancient times, the traditional mid-wives or the native doctors did this. Any other person who has it as his/her duty. However, in more contemporary times, the medical practitioners circumcise new born babies in the hospital

WHEN IS CIRCUMCISION DONE 


    Ordinarily in Igbo culture, circumcision is done on the 8th day after birth, that is, two weeks (according to the Igbo traditional way of counting weeks). Though there are some part of Igbo where circumcision is done on the 3rd day after birth. There are, also, rare cases of circumcision as an adult. Though it takes longer time to perform and heal in adults. In children it takes an average of 5 to 7 days to heal.

ARE THERE ANY BENEFITS OF CIRCUMCISION 


    It is believed that the act of circumcision have numerous benefit for the male gender which includes:
  • To avoid infections like urinary infections
  • To keep the genitalia clean
  • Even to control STDs

ARE THERE ANY NEGATIVE CONSEQUENCE OF CIRCUMCISION 


    The few negative consequence of circumcision could include:
  • The process could be painful.
  • There could be infection during the process.
  • It can injure the genitalia if not done carefully.

YOU CAN LEAVE YOUR COMMENTS IN THE COMMENTS SECTIONS


CHECK OUT OUR OTHER POSTS:

No comments:

Post a Comment